Exodus 31

Bezalel na Oholiab

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 2“Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, 3emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, 4ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz, 5ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche. 6Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel.

“Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ:

7“ya bụ, ụlọ nzute ahụ,
na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu,
na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ,
8na tebul, na ngwongwo ya,
ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha,
na ngwongwo ya,
9na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya,
na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.
10Na uwe ọma ahụ akpara akpa,
ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja
na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja.
11Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ.

“Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”

Ụbọchị izuike

12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, 13Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.

14“ ‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ. 15Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ. 16Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi. 17Ọ ga-abụ ihe ịrịbama nke ga-adịgide nʼetiti mụ na ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na nʼụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa. Ọ kwụsịrị ọrụ nʼụbọchị nke asaa, zuo ike, turu ndụ.’ ”

18Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Mosis okwu ndị a nʼelu ugwu Saịnaị, o nyere ya mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụkwa mbadamba nkume ndị ahụ nke mkpịsịaka Chineke dere ihe nʼelu ha.

Copyright information for IboBIU